Native Bible

Ecclesiastes 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.

Ecclesiastes 3:12 in English

Ecclesiastes 3:12 · Berean Standard Bible

I know that there is nothing better for them than to rejoice and do good while they live,

Context

10Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke. 11O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ. 12Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile. 13Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. 14Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.