Native Bible

Ecclesiastes 3:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.

Ecclesiastes 3:13 in English

Ecclesiastes 3:13 · Berean Standard Bible

and also that every man should eat and drink and find satisfaction in all his labor—this is the gift of God.

Context

11O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ. 12Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile. 13Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. 14Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya. 15Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.