Ekiliziastis 1:6
Ecclesiastes 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ifufe na-efe gaa na ndịda; feekwa gburugburu gaa nʼugwu, ọ na-efegharị gburugburu ebe niile; na-efe na-enweghịkwa nsọtụ.
Ecclesiastes 1:6 in English
Ecclesiastes 1:6 · Berean Standard Bible
The wind blows southward, then turns northward; round and round it swirls, ever returning on its course.
Context
4Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa,
ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi. 5Anyanwụ na-awa, na-adakwa,
ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta. 6Ifufe na-efe gaa na ndịda;
feekwa gburugburu gaa nʼugwu,
ọ na-efegharị gburugburu ebe niile;
na-efe na-enweghịkwa nsọtụ. 7Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri
ma oke osimiri ejughị eju.
Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a,
malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri. 8Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;
ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ.
Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị.
Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.