Native Bible

Ecclesiastes 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa, ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi.

Ecclesiastes 1:4 in English

Ecclesiastes 1:4 · Berean Standard Bible

Generations come and generations go, but the earth remains forever.

Context

2Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu ka onye ozizi na-ekwu. Ihe na-enweghị isi* ka ihe niile bụ. Ihe niile bụ nnọọ ihe efu. 3Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ? 4Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa, ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi. 5Anyanwụ na-awa, na-adakwa, ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta. 6Ifufe na-efe gaa na ndịda; feekwa gburugburu gaa nʼugwu, ọ na-efegharị gburugburu ebe niile; na-efe na-enweghịkwa nsọtụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.