Native Bible

Ecclesiastes 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu ka onye ozizi na-ekwu. Ihe na-enweghị isi* ka ihe niile bụ. Ihe niile bụ nnọọ ihe efu.

Ecclesiastes 1:2 in English

Ecclesiastes 1:2 · Berean Standard Bible

“Futility * of futilities,” says the Teacher, “futility of futilities! Everything is futile!”

Context

1Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem. 2Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu ka onye ozizi na-ekwu. Ihe na-enweghị isi* ka ihe niile bụ. Ihe niile bụ nnọọ ihe efu. 3Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ? 4Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa, ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.