Ekiliziastis 1:5
Ecclesiastes 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyanwụ na-awa, na-adakwa, ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta.
Ecclesiastes 1:5 in English
Ecclesiastes 1:5 · Berean Standard Bible
The sun rises and the sun sets; it hurries back to where it rises.
Context
3Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile
ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ? 4Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa,
ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi. 5Anyanwụ na-awa, na-adakwa,
ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta. 6Ifufe na-efe gaa na ndịda;
feekwa gburugburu gaa nʼugwu,
ọ na-efegharị gburugburu ebe niile;
na-efe na-enweghịkwa nsọtụ. 7Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri
ma oke osimiri ejughị eju.
Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a,
malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.