Ekiliziastis 1:8
Ecclesiastes 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ; ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ. Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị. Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị.
Ecclesiastes 1:8 in English
Ecclesiastes 1:8 · Berean Standard Bible
All things are wearisome, more than one can describe; the eye is not satisfied with seeing, nor the ear content with hearing.
Context
6Ifufe na-efe gaa na ndịda;
feekwa gburugburu gaa nʼugwu,
ọ na-efegharị gburugburu ebe niile;
na-efe na-enweghịkwa nsọtụ. 7Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri
ma oke osimiri ejughị eju.
Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a,
malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri. 8Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;
ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ.
Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị.
Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị. 9Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.
Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ. 10Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,
“Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”?
Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga,
nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.