Ekiliziastis 1:9
Ecclesiastes 1:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ. Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ.
Ecclesiastes 1:9 in English
Ecclesiastes 1:9 · Berean Standard Bible
What has been will be again, and what has been done will be done again; there is nothing new under the sun.
Context
7Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri
ma oke osimiri ejughị eju.
Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a,
malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri. 8Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;
ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ.
Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị.
Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị. 9Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.
Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ. 10Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,
“Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”?
Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga,
nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị. 11Anaghị echeta ndị mgbe ochie,
otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa
ndị ga-eso ha
agakwaghị echeta ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.