Ekiliziastis 1:11
Ecclesiastes 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anaghị echeta ndị mgbe ochie, otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa ndị ga-eso ha agakwaghị echeta ha.
Ecclesiastes 1:11 in English
Ecclesiastes 1:11 · Berean Standard Bible
There is no remembrance of those who came before, and those yet to come will not be remembered by those who follow after.
Context
9Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.
Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ. 10Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,
“Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”?
Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga,
nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị. 11Anaghị echeta ndị mgbe ochie,
otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa
ndị ga-eso ha
agakwaghị echeta ha. 12Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem. 13Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.