Native Bible

Ecclesiastes 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem.

Ecclesiastes 1:12 in English

Ecclesiastes 1:12 · Berean Standard Bible

I, the Teacher, was king over Israel in Jerusalem.

Context

10Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị, “Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”? Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga, nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị. 11Anaghị echeta ndị mgbe ochie, otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa ndị ga-eso ha agakwaghị echeta ha. 12Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem. 13Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ? 14Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.