Diuteronomi 33:3
Deuteronomy 33:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, ọ bụ gị na-ahụ ndị mmadụ ahụ nʼanya, ndị nsọ ahụ niile dị gị nʼaka. Nʼụkwụ gị ka ha na-ada kpọọ isiala, gị na-akụziri ha ihe,
Deuteronomy 33:3 in English
Deuteronomy 33:3 · Berean Standard Bible
Surely You love the people; all the holy ones are in Your hand, and they sit down at Your feet;* each receives Your words—
Context
1Nke a bụ ngọzị Mosis, onye nke Chineke, jiri gọzie ụmụ Izrel, tupu ọ nwụọ. 2Ọ sịrị,
“Onyenwe anyị si nʼugwu Saịnaị bịa,
ọ waliteere ha site nʼugwu Sia,
o nwupụtara site nʼugwu Paran
Ya na igwe ndị nsọ so bịa
site nʼakụkụ ndịda, site nʼala ala ugwu ahụ. 3Nʼezie, ọ bụ gị na-ahụ ndị mmadụ ahụ nʼanya,
ndị nsọ ahụ niile dị gị nʼaka.
Nʼụkwụ gị ka ha na-ada kpọọ isiala,
gị na-akụziri ha ihe, 4iwu ahụ Mosis nyere anyị,
ihe onwunwe nke ọgbakọ Jekọb. 5Ọ bụ ya bụ eze na Jeshurun,
mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ
ha na ebo niile nke Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.