Native Bible

Deuteronomy 33:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ ngọzị Mosis, onye nke Chineke, jiri gọzie ụmụ Izrel, tupu ọ nwụọ.

Deuteronomy 33:1 in English

Deuteronomy 33:1 · Berean Standard Bible

This is the blessing that Moses the man of God pronounced upon the Israelites before his death.

Context

1Nke a bụ ngọzị Mosis, onye nke Chineke, jiri gọzie ụmụ Izrel, tupu ọ nwụọ. 2Ọ sịrị, “Onyenwe anyị si nʼugwu Saịnaị bịa, ọ waliteere ha site nʼugwu Sia, o nwupụtara site nʼugwu Paran Ya na igwe ndị nsọ so bịa site nʼakụkụ ndịda, site nʼala ala ugwu ahụ. 3Nʼezie, ọ bụ gị na-ahụ ndị mmadụ ahụ nʼanya, ndị nsọ ahụ niile dị gị nʼaka. Nʼụkwụ gị ka ha na-ada kpọọ isiala, gị na-akụziri ha ihe,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.