Emọs 9:8
Amos 9:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie. Aghaghị m ịla ya nʼiyi, kpochapụ ya site nʼelu ụwa, naanị na m agaghị ebibicha ụlọ Jekọb kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Amos 9:8 in English
Amos 9:8 · Berean Standard Bible
Surely the eyes of the Lord GOD are on the sinful kingdom, and I will destroy it from the face of the earth. Yet I will not utterly destroy the house of Jacob,” declares the LORD.
Context
6Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile,
na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa.
Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,
ma na-awụsa ha nʼala,
aha ya bụ Onyenwe anyị. 7“Ọ bụ na unu ndị Izrel
adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel,
site na Kafto kpọpụta ndị Filistia,
ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia? 8“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị
nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie.
Aghaghị m ịla ya nʼiyi,
kpochapụ ya site nʼelu ụwa,
naanị na m agaghị ebibicha
ụlọ Jekọb kpamkpam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 9“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu,
aga m ayọgharị ụlọ Izrel
nʼetiti mba niile
dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ,
ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala. 10Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m,
ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị,
anyị agaghị ezute ya,
aghaghị ịnwụ site na mma agha.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.