Emọs 9:6
Amos 9:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, ma na-awụsa ha nʼala, aha ya bụ Onyenwe anyị.
Amos 9:6 in English
Amos 9:6 · Berean Standard Bible
He builds His upper rooms in the heavens and founds His vault upon the earth. He summons the waters of the sea and pours them over the face of the earth. The LORD is His name.
Context
4Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ,
nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha.
“Aga m elekwasị ha anya m abụọ
nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.” 5Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee,
ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ;
ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl,
nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt. 6Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile,
na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa.
Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,
ma na-awụsa ha nʼala,
aha ya bụ Onyenwe anyị. 7“Ọ bụ na unu ndị Izrel
adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel,
site na Kafto kpọpụta ndị Filistia,
ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia? 8“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị
nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie.
Aghaghị m ịla ya nʼiyi,
kpochapụ ya site nʼelu ụwa,
naanị na m agaghị ebibicha
ụlọ Jekọb kpamkpam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.