Emọs 9:4
Amos 9:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. “Aga m elekwasị ha anya m abụọ nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”
Amos 9:4 in English
Amos 9:4 · Berean Standard Bible
Though they are driven by their enemies into captivity, there I will command the sword to slay them. I will fix My eyes upon them for harm and not for good.”
Context
2Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ,
site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha,
ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe,
site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala. 3Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel
nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha,
a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri,
nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha. 4Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ,
nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha.
“Aga m elekwasị ha anya m abụọ
nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.” 5Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee,
ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ;
ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl,
nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt. 6Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile,
na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa.
Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,
ma na-awụsa ha nʼala,
aha ya bụ Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.