Emọs 9:7
Amos 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụ na unu ndị Izrel adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel, site na Kafto kpọpụta ndị Filistia, ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?
Amos 9:7 in English
Amos 9:7 · Berean Standard Bible
“Are you not like the Cushites * to Me, O children of Israel?” declares the LORD. “Did I not bring Israel up from the land of Egypt, the Philistines from Caphtor,* and the Arameans from Kir?
Context
5Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee,
ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ;
ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl,
nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt. 6Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile,
na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa.
Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,
ma na-awụsa ha nʼala,
aha ya bụ Onyenwe anyị. 7“Ọ bụ na unu ndị Izrel
adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel,
site na Kafto kpọpụta ndị Filistia,
ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia? 8“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị
nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie.
Aghaghị m ịla ya nʼiyi,
kpochapụ ya site nʼelu ụwa,
naanị na m agaghị ebibicha
ụlọ Jekọb kpamkpam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 9“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu,
aga m ayọgharị ụlọ Izrel
nʼetiti mba niile
dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ,
ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.