Emọs 9:10
Amos 9:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m, ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị, anyị agaghị ezute ya, aghaghị ịnwụ site na mma agha.’
Amos 9:10 in English
Amos 9:10 · Berean Standard Bible
All the sinners among My people will die by the sword— all those who say, ‘Disaster will never draw near or confront us.’”
Context
8“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị
nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie.
Aghaghị m ịla ya nʼiyi,
kpochapụ ya site nʼelu ụwa,
naanị na m agaghị ebibicha
ụlọ Jekọb kpamkpam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 9“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu,
aga m ayọgharị ụlọ Izrel
nʼetiti mba niile
dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ,
ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala. 10Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m,
ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị,
anyị agaghị ezute ya,
aghaghị ịnwụ site na mma agha.’ 11“Nʼụbọchị ahụ,
“aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa.
Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji,
mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ.
Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ. 12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm
tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.”
Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.