Native Bible

Amos 9:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼụbọchị ahụ, “aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa. Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji, mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ. Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.

Amos 9:11 in English

Amos 9:11 · Berean Standard Bible

“In that day I will restore the fallen tent of David. I will repair its gaps, restore its ruins, and rebuild it as in the days of old,

Context

9“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu, aga m ayọgharị ụlọ Izrel nʼetiti mba niile dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ, ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala. 10Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m, ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị, anyị agaghị ezute ya, aghaghị ịnwụ site na mma agha.’ 11“Nʼụbọchị ahụ, “aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa. Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji, mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ. Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ. 12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.” Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya. 13“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi, onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa. Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta, ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.