Emọs 9:11
Amos 9:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ, “aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa. Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji, mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ. Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.
Amos 9:11 in English
Amos 9:11 · Berean Standard Bible
“In that day I will restore the fallen tent of David. I will repair its gaps, restore its ruins, and rebuild it as in the days of old,
Context
9“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu,
aga m ayọgharị ụlọ Izrel
nʼetiti mba niile
dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ,
ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala. 10Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m,
ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị,
anyị agaghị ezute ya,
aghaghị ịnwụ site na mma agha.’ 11“Nʼụbọchị ahụ,
“aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa.
Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji,
mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ.
Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ. 12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm
tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.”
Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya. 13“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi,
onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa.
Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta,
ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.