Emọs 9:13
Amos 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi, onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa. Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta, ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.
Amos 9:13 in English
Amos 9:13 · Berean Standard Bible
“Behold, the days are coming,” declares the LORD, “when the plowman will overtake the reaper and the treader of grapes, the sower of seed. The mountains will drip with sweet wine, with which all the hills will flow.
Context
11“Nʼụbọchị ahụ,
“aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa.
Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji,
mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ.
Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ. 12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm
tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.”
Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya. 13“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi,
onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa.
Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta,
ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta. 14Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta.*
“Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha.
Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya.
Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya. 15Aga m akụ Izrel nʼala ha.*
A gaghị ehopukwa ha ọzọ
site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.”
Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.
9:14 Aga m emekwa ka ndị m Izrel nwetakwa ihe ọma niile.
9:15 Ya bụ, ime ka ha biri nʼala ha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.