Emọs 9:14
Amos 9:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta.* “Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha. Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya. Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.
Amos 9:14 in English
Amos 9:14 · Berean Standard Bible
I will restore My people Israel from captivity;* they will rebuild and inhabit the ruined cities. They will plant vineyards and drink their wine; they will make gardens and eat their fruit.
Context
12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm
tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.”
Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya. 13“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi,
onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa.
Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta,
ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta. 14Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta.*
“Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha.
Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya.
Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya. 15Aga m akụ Izrel nʼala ha.*
A gaghị ehopukwa ha ọzọ
site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.”
Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.
9:14 Aga m emekwa ka ndị m Izrel nwetakwa ihe ọma niile.
9:15 Ya bụ, ime ka ha biri nʼala ha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.