Emọs 5:13
Amos 5:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ, nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ.
Amos 5:13 in English
Amos 5:13 · Berean Standard Bible
Therefore, the prudent keep silent in such times, for the days are evil.
Context
11Unu na-azọpịa ndị ogbenye,
na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha.
Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa,
ma unu agaghị ebi nʼime ha.
Unu akụọla ubi vaịnị mara mma,
ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha. 12Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba,
matakwa ọtụtụ mmehie unu niile.
Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị.
Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama. 13Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ,
nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ. 14Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ;
ka unu dịrị ndụ.
Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu,
dịka unu si kwuo. 15Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya.
Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu.
O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile
ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.