Emọs 5:11
Amos 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu na-azọpịa ndị ogbenye, na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha. Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa, ma unu agaghị ebi nʼime ha. Unu akụọla ubi vaịnị mara mma, ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.
Amos 5:11 in English
Amos 5:11 · Berean Standard Bible
Therefore, because you trample on the poor and exact from him a tax of grain, you will never live in the stone houses you have built; you will never drink the wine from the lush vineyards you have planted.
Context
9Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya,
na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike. 10Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị,
na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya. 11Unu na-azọpịa ndị ogbenye,
na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha.
Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa,
ma unu agaghị ebi nʼime ha.
Unu akụọla ubi vaịnị mara mma,
ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha. 12Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba,
matakwa ọtụtụ mmehie unu niile.
Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị.
Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama. 13Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ,
nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.