Emọs 5:9
Amos 5:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya, na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike.
Amos 5:9 in English
Amos 5:9 · Berean Standard Bible
He flashes destruction on the strong, so that fury comes upon the stronghold.
Context
7Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu,
na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala. 8Onye mere kpakpando pleiades na orion,
onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ,
na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị,
onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,
wụsa ha nʼelu ala akọrọ,
Onyenwe anyị bụ aha ya. 9Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya,
na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike. 10Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị,
na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya. 11Unu na-azọpịa ndị ogbenye,
na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha.
Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa,
ma unu agaghị ebi nʼime ha.
Unu akụọla ubi vaịnị mara mma,
ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.