Emọs 5:14
Amos 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ; ka unu dịrị ndụ. Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu, dịka unu si kwuo.
Amos 5:14 in English
Amos 5:14 · Berean Standard Bible
Seek good, not evil, so that you may live. And the LORD, the God of Hosts, will be with you, as you have claimed.
Context
12Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba,
matakwa ọtụtụ mmehie unu niile.
Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị.
Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama. 13Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ,
nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ. 14Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ;
ka unu dịrị ndụ.
Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu,
dịka unu si kwuo. 15Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya.
Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu.
O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile
ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef. 16Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị,
“Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile;
ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa.
A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa,
kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.