Native Bible

Amos 5:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị, “Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile; ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa. A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa, kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa.

Amos 5:16 in English

Amos 5:16 · Berean Standard Bible

Therefore this is what the LORD, the God of Hosts, the Lord, says: “There will be wailing in all the public squares and cries of ‘Alas! Alas!’ in all the streets. The farmer will be summoned to mourn, and the mourners to wail.

Context

14Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ; ka unu dịrị ndụ. Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu, dịka unu si kwuo. 15Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya. Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu. O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef. 16Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị, “Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile; ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa. A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa, kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa. 17A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile, nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,” ka Onyenwe anyị kwuru. 18Ahụhụ dịrị unu,* ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike. Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ? Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.