Emọs 5:17
Amos 5:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile, nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,” ka Onyenwe anyị kwuru.
Amos 5:17 in English
Amos 5:17 · Berean Standard Bible
There will be wailing in all the vineyards, for I will pass through your midst,” says the LORD.
Context
15Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya.
Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu.
O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile
ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef. 16Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị,
“Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile;
ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa.
A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa,
kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa. 17A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile,
nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,”
ka Onyenwe anyị kwuru. 18Ahụhụ dịrị unu,*
ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike.
Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ?
Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè. 19Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ
ma zute anụ ọhịa bịa,
maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike
ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ,
agwọ ataa ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.