Emọs 5:19
Amos 5:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ ma zute anụ ọhịa bịa, maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ, agwọ ataa ya.
Amos 5:19 in English
Amos 5:19 · Berean Standard Bible
It will be like a man who flees from a lion, only to encounter a bear, or who enters his house and rests his hand against the wall, only to be bitten by a snake.
Context
17A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile,
nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,”
ka Onyenwe anyị kwuru. 18Ahụhụ dịrị unu,*
ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike.
Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ?
Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè. 19Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ
ma zute anụ ọhịa bịa,
maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike
ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ,
agwọ ataa ya. 20Ụbọchị Onyenwe anyị ọ gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè,
nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya? 21“Akpọrọ m mmemme oriri na ọṅụṅụ unu asị, ajụla m ya.
Nnọkọ nke oke nzukọ unu adịghị atọkwa m ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.