Ọrụ Ndị Ozi 13:37
Acts 13:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure.
Acts 13:37 in English
Acts 13:37 · Berean Standard Bible
But the One whom God raised from the dead did not see decay.
Context
35E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma,
“ ‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’* 36“Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure. 37Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure. 38“Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu. 39A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.