Ọrụ Ndị Ozi 13:39
Acts 13:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume.
Acts 13:39 in English
Acts 13:39 · Berean Standard Bible
Through Him everyone who believes is justified from everything you could not be justified from by the law of Moses.
Context
37Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure. 38“Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu. 39A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume. 40Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu. 41“ ‘Lee, unu ndị na-akwa emo,
nọrọnụ na mgbagwoju anya ma lakwanụ nʼiyi.
Nʼihi na agaje m ime otu ihe nʼụbọchị unu
nke unu na-agaghị ekwe na o mere,
ọ bụladị na mmadụ kọrọ unu maka ya.’*”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.