2 Samuel 22:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu; Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.*
2 Samuel 22:5 in English
2 Samuel 22:5 · Berean Standard Bible
For the waves of death engulfed me; the torrents of chaos overwhelmed me.
Context
3Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m.
Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m,
site nʼaka ndị na-eme ihe ike. 4“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.
Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 5Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;
Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.* 6Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,
Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. 7“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
akpọkuru m Chineke m.
Akwa m ruru ya ntị.
O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.