2 Samuel 22:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike.
2 Samuel 22:3 in English
2 Samuel 22:3 · Berean Standard Bible
My God is my rock, in whom I take refuge, my shield, and the horn of my salvation. My stronghold, my refuge, and my Savior, You save me from violence.
Context
1Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. 2Ọ sịrị:
“Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. 3Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m.
Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m,
site nʼaka ndị na-eme ihe ike. 4“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.
Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 5Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;
Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.