Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị: “Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.

2 Samuel 22:2 in English

2 Samuel 22:2 · Berean Standard Bible

He said: “The LORD is my rock, my fortress, and my deliverer.

Context

1Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. 2Ọ sịrị: “Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. 3Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike. 4“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto. Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.