2 Samuel 22:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m.
2 Samuel 22:6 in English
2 Samuel 22:6 · Berean Standard Bible
The cords of Sheol entangled me; the snares of death confronted me.
Context
4“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.
Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 5Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;
Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.* 6Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,
Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. 7“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
akpọkuru m Chineke m.
Akwa m ruru ya ntị.
O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. 8Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,
ntọala eluigwe makwara jijiji,
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.