Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji, ntọala eluigwe makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.

2 Samuel 22:8 in English

2 Samuel 22:8 · Berean Standard Bible

Then the earth shook and quaked; the foundations of the heavens * trembled; they were shaken because He burned with anger.

Context

6Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. 7“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, akpọkuru m Chineke m. Akwa m ruru ya ntị. O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. 8Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji, ntọala eluigwe makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 9Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta; Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta. Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 10O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.