2 Samuel 22:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
2 Samuel 22:10 in English
2 Samuel 22:10 · Berean Standard Bible
He parted the heavens and came down with dark clouds beneath His feet.
Context
8Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,
ntọala eluigwe makwara jijiji,
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 9Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;
Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta.
Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 10O kewara mbara eluigwe, rịdata;
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 11Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,
O feliri elu nʼelu nku nke ifufe. 12O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.