2 Samuel 22:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta; Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta. Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
2 Samuel 22:9 in English
2 Samuel 22:9 · Berean Standard Bible
Smoke rose from His nostrils, and consuming fire came from His mouth; glowing coals blazed forth.
Context
7“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
akpọkuru m Chineke m.
Akwa m ruru ya ntị.
O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. 8Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,
ntọala eluigwe makwara jijiji,
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 9Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;
Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta.
Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 10O kewara mbara eluigwe, rịdata;
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 11Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,
O feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.