2 Samuel 22:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, O feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
2 Samuel 22:11 in English
2 Samuel 22:11 · Berean Standard Bible
He mounted a cherub and flew; He soared * on the wings of the wind.
Context
9Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;
Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta.
Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 10O kewara mbara eluigwe, rịdata;
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 11Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,
O feliri elu nʼelu nku nke ifufe. 12O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. 13Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,
amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.