2 Samuel 1:25
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha. E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;
2 Samuel 1:25 in English
2 Samuel 1:25 · Berean Standard Bible
How the mighty have fallen in the thick of battle! Jonathan lies slain on your heights.
Context
23Sọl na Jonatan,
na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara.
Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha.
Ha dị gara gara karịa ugo.
Ha dị ike karịa ọdụm. 24“Ụmụada* Izrel,
kwaaranụ Sọl akwa.
Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma.
Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma. 25“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha.
E gbuola Jonatan nʼelu ugwu; 26ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m
nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m.
Ịhụnanya* i nwere nʼebe m nọ dị omimi
karịa ịhụnanya ndị nwanyị. 27“Lee ka ndị dị ike si daa!
Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!”
1:20 Obodo Gat na Ashkelọn dị nʼala Filistia. 1Sa 6:17; 1Sa 27:2
1:20 Otu obodo nʼime ala ndị Filistia Jer 25:20
1:21 Ka ubi unu dị nʼelu ugwu ghara ịmịpụta mkpụrụ
1:21 Ọ bụ akpụkpọ anụ a mịkpọrọ amịkpọ, nke e tere mmanụ ka e ji eme ọta. Ọ bụ mmanụ ahụ e teere ya, na-eme ka ọ ghara ịma ebu, meekwa ka ọ na-amị amị, i ji gbochie ka àkụ a gbara ghara imife nʼọta ahụ. Ma ọta ndị a, nʼihi na ha amịjuola ọbara nʼebe ọ dị ukwuu, ha adịghị abakwa uru ọta na-aba nʼoge agha.
1:24 Maọbụ, Ụmụ ndị inyom Izrel.
1:26 1Sa 18:1-4; 19:2; 20:17
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.