2 Samuel 1:24
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụmụada* Izrel, kwaaranụ Sọl akwa. Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.
2 Samuel 1:24 in English
2 Samuel 1:24 · Berean Standard Bible
O daughters of Israel, weep for Saul, who clothed you in scarlet and luxury, who decked your garments with ornaments of gold.
Context
22“Site nʼọbara ndị e gburu egbu,
site nʼanụ ahụ ndị dị ike.
Ụta Jonatan alọghachighị azụ.
Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi. 23Sọl na Jonatan,
na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara.
Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha.
Ha dị gara gara karịa ugo.
Ha dị ike karịa ọdụm. 24“Ụmụada* Izrel,
kwaaranụ Sọl akwa.
Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma.
Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma. 25“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha.
E gbuola Jonatan nʼelu ugwu; 26ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m
nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m.
Ịhụnanya* i nwere nʼebe m nọ dị omimi
karịa ịhụnanya ndị nwanyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.