2 Samuel 1:23
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sọl na Jonatan, na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. Ha dị gara gara karịa ugo. Ha dị ike karịa ọdụm.
2 Samuel 1:23 in English
2 Samuel 1:23 · Berean Standard Bible
Saul and Jonathan, beloved and delightful in life, were not divided in death. They were swifter than eagles, they were stronger than lions.
Context
21“Unu ugwu Gilboa,
ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu.
Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.*
Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta* ndị dị ike.
E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ. 22“Site nʼọbara ndị e gburu egbu,
site nʼanụ ahụ ndị dị ike.
Ụta Jonatan alọghachighị azụ.
Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi. 23Sọl na Jonatan,
na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara.
Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha.
Ha dị gara gara karịa ugo.
Ha dị ike karịa ọdụm. 24“Ụmụada* Izrel,
kwaaranụ Sọl akwa.
Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma.
Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma. 25“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha.
E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.