Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.* Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta* ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ.

2 Samuel 1:21 in English

2 Samuel 1:21 · Berean Standard Bible

O mountains of Gilboa, may you have no dew or rain, no fields yielding offerings of grain.* For there the shield of the mighty was defiled, the shield of Saul, no longer anointed with oil.

Context

19“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa! 20“Ekwutela ya na Gat.* Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn.* Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ. 21“Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.* Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta* ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ. 22“Site nʼọbara ndị e gburu egbu, site nʼanụ ahụ ndị dị ike. Ụta Jonatan alọghachighị azụ. Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi. 23Sọl na Jonatan, na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. Ha dị gara gara karịa ugo. Ha dị ike karịa ọdụm.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.