2 Samuel 1:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.* Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta* ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ.
2 Samuel 1:21 in English
2 Samuel 1:21 · Berean Standard Bible
O mountains of Gilboa, may you have no dew or rain, no fields yielding offerings of grain.* For there the shield of the mighty was defiled, the shield of Saul, no longer anointed with oil.
Context
19“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu.
Lee ka ndị bụ dike si daa! 20“Ekwutela ya na Gat.*
Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn.*
Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ.
Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ. 21“Unu ugwu Gilboa,
ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu.
Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.*
Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta* ndị dị ike.
E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ. 22“Site nʼọbara ndị e gburu egbu,
site nʼanụ ahụ ndị dị ike.
Ụta Jonatan alọghachighị azụ.
Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi. 23Sọl na Jonatan,
na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara.
Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha.
Ha dị gara gara karịa ugo.
Ha dị ike karịa ọdụm.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.