Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ekwutela ya na Gat.* Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn.* Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.

2 Samuel 1:20 in English

2 Samuel 1:20 · Berean Standard Bible

Tell it not in Gath; proclaim it not in the streets of Ashkelon, lest the daughters of the Philistines rejoice, and the daughters of the uncircumcised exult.

Context

18O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha. 19“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa! 20“Ekwutela ya na Gat.* Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn.* Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ. 21“Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.* Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta* ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ. 22“Site nʼọbara ndị e gburu egbu, site nʼanụ ahụ ndị dị ike. Ụta Jonatan alọghachighị azụ. Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.