Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.

2 Samuel 1:18 in English

2 Samuel 1:18 · Berean Standard Bible

and he ordered that the sons of Judah be taught the Song of the Bow.* It is written in the Book of Jashar:*

Context

16Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ ” 17Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan. 18O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha. 19“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa! 20“Ekwutela ya na Gat.* Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn.* Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.