Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan.

2 Samuel 1:17 in English

2 Samuel 1:17 · Berean Standard Bible

Then David took up this lament for Saul and his son Jonathan,

Context

15Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya. 16Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ ” 17Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan. 18O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha. 19“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.