2 Samuel 1:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Site nʼọbara ndị e gburu egbu, site nʼanụ ahụ ndị dị ike. Ụta Jonatan alọghachighị azụ. Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi.
2 Samuel 1:22 in English
2 Samuel 1:22 · Berean Standard Bible
From the blood of the slain, from the fat of the mighty, the bow of Jonathan did not retreat, and the sword of Saul did not return empty.
Context
20“Ekwutela ya na Gat.*
Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn.*
Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ.
Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ. 21“Unu ugwu Gilboa,
ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu.
Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.*
Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta* ndị dị ike.
E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ. 22“Site nʼọbara ndị e gburu egbu,
site nʼanụ ahụ ndị dị ike.
Ụta Jonatan alọghachighị azụ.
Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi. 23Sọl na Jonatan,
na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara.
Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha.
Ha dị gara gara karịa ugo.
Ha dị ike karịa ọdụm. 24“Ụmụada* Izrel,
kwaaranụ Sọl akwa.
Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma.
Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.