2 Ndị Eze 19:27
2 Kings 19:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ marakwa ọpụpụ gị na mbata gị marakwa oke iwe gị megide m.
2 Kings 19:27 in English
2 Kings 19:27 · Berean Standard Bible
But I know your sitting down, your going out and coming in, and your raging against Me.
Context
25“ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị?
Na mgbe ochie ka m kpebiri ya.
Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya;
ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu,
na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu,
ghọọ mkpokọta nkume. 26Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere
bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.
Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi
na ome na-epupụta epupụta
nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ
nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. 27“ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ
marakwa ọpụpụ gị na mbata gị
marakwa oke iwe gị megide m. 28Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,
nʼihi na mkparị gị eruola m ntị,
aga m etinye nko m nʼimi gị
werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị
mee ka ị laghachi
site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’ 29“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya:
“Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,
nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta.
Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi;
kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.