2 Ndị Eze 19:25
2 Kings 19:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.
2 Kings 19:25 in English
2 Kings 19:25 · Berean Standard Bible
Have you not heard? Long ago I ordained it; in days of old I planned it. Now I have brought it to pass, that you should crush fortified cities into piles of rubble.
Context
23I sitere nʼaka ndị ozi gị
kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya,
ị sịkwara,
“Eji m ọtụtụ ụgbọala m
rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile,
nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn.
Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo,
na osisi junipa ya niile kachasị mma.
Ejeruola m na nsọtụ niile ya,
bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile. 24Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ,
ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ.
Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee
ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.” 25“ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị?
Na mgbe ochie ka m kpebiri ya.
Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya;
ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu,
na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu,
ghọọ mkpokọta nkume. 26Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere
bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.
Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi
na ome na-epupụta epupụta
nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ
nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. 27“ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ
marakwa ọpụpụ gị na mbata gị
marakwa oke iwe gị megide m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.