Native Bible

2 Kings 19:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, “Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ niile ya, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.

2 Kings 19:23 in English

2 Kings 19:23 · Berean Standard Bible

Through your servants you have taunted the Lord, and you have said: “With my many chariots I have ascended to the heights of the mountains, to the remote peaks of Lebanon. I have cut down its tallest cedars, the finest of its cypresses.* I have reached its farthest outposts, the densest of its forests.

Context

21Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị kwuru megide ya: “ ‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ Ada Zayọn na-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị. Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ 22Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide Onye Nsọ nke Izrel? 23I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, “Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ niile ya, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile. 24Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.” 25“ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.