2 Ndị Eze 19:21
2 Kings 19:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị kwuru megide ya: “ ‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ Ada Zayọn na-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị. Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ
2 Kings 19:21 in English
2 Kings 19:21 · Berean Standard Bible
This is the word that the LORD has spoken against him: ‘The Virgin Daughter of Zion despises you and mocks you; the Daughter of Jerusalem shakes her head behind you.
Context
19Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị, naanị, bụ Chineke.” 20Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara Hezekaya ozi sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere Senakerib, eze Asịrịa. 21Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị kwuru megide ya:
“ ‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ Ada Zayọn
na-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị.
Nwaada Jerusalem
na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ 22Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa?
Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị
welie olu okwu gị na anya gị elu megide?
Ọ bụ megide Onye Nsọ nke Izrel? 23I sitere nʼaka ndị ozi gị
kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya,
ị sịkwara,
“Eji m ọtụtụ ụgbọala m
rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile,
nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn.
Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo,
na osisi junipa ya niile kachasị mma.
Ejeruola m na nsọtụ niile ya,
bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.