Native Bible

2 Kings 19:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’

2 Kings 19:28 in English

2 Kings 19:28 · Berean Standard Bible

Because your rage and arrogance against Me have reached My ears, I will put My hook in your nose and My bit in your mouth; I will send you back the way you came.’

Context

26Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. 27“ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ marakwa ọpụpụ gị na mbata gị marakwa oke iwe gị megide m. 28Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’ 29“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya: “Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi; kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 30Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.