2 Ndị Eze 19:28
2 Kings 19:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’
2 Kings 19:28 in English
2 Kings 19:28 · Berean Standard Bible
Because your rage and arrogance against Me have reached My ears, I will put My hook in your nose and My bit in your mouth; I will send you back the way you came.’
Context
26Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere
bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.
Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi
na ome na-epupụta epupụta
nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ
nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. 27“ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ
marakwa ọpụpụ gị na mbata gị
marakwa oke iwe gị megide m. 28Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,
nʼihi na mkparị gị eruola m ntị,
aga m etinye nko m nʼimi gị
werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị
mee ka ị laghachi
site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’ 29“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya:
“Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,
nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta.
Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi;
kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 30Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda
ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.